Esther 1

Ọdịda eze nwanyị Vashti

1Nke a bụ ihe mere nʼoge ọchịchị eze Sekses, bụ Sekses nke chiri alaeze
E kewara alaeze a ụzọ isi, nwee isi ọchịchị iri abụọ. Mpaghara ọbụla nọ nʼokpuru otu isi ọchịchị.
nwere mpaghara dị iche iche nke karịrị otu narị na iri abụọ na asaa (127), nke gbasakwara site nʼIndia rụọ Kush.
Nke bụ mgbago osimiri Naịl
2Nʼoge ahụ, isi ọchịchị obodo eze Sekses bụ Susa
Susa bụ otu nʼime isi obodo anọ nke alaeze ahụ. Ndị ọzọ bụ Babilọn, Peshịapolis na Ekbatana. Obodo Susa bụ na ndagwurugwu Taịgria ka ọ dị, ọ bụkwa nʼebe ahụ ka ndị eze atọ chịrị alaeze a na-anọ nʼoge oke oyi.
ebe ocheeze ya dịkwa.
3Nʼafọ nke atọ nke ọchịchị ya, o mere mmemme oke oriri nye ndịisi ọrụ ya niile. Ndị ọzọ ọ kpọkwara bụ ndịisi agha nke Peshịa na Midia, na ụmụ eze, na ndị ọchịchị sitere na mba dị iche iche ọ na-achị.

4Mmemme a were otu narị na iri ụbọchị asatọ (180). Eze jikwa oge a gosi akụnụba, na ịma mma na ebube nke alaeze ya. 5Mgbe ụbọchị ndị a gafesịrị, eze kpọrọ oke oriri nọrọ ụbọchị asaa nʼubi a gbara ogige dị nʼụlọeze, nye ndị niile nọ na Susa, site nʼonye ukwu ruo nʼonye nta. 6Ihe ịchọ mma e ji dozie ogige ahụ bụ ezi akwa mgbochi dị ọcha, nke e ji ogho ọcha kpaa na nke e jikwa ogho na-acha anụnụ anụnụ kpaa. E jikwa eriri ogho dị ezi ọcha na nke na-acha odo odo kekọtaa akwa mgbochi ndị ahụ, nʼihe mgbaaka ọlaọcha dị nʼogidi nkume dị oke ọnụahịa e wuru nʼebe ahụ. A dọbakwara oche
Ndị Peshịa na-adabere nʼoche ma ha na-eri ihe.
ọlaọcha na ọlaedo ndị ahụ nʼebe e wulitụrụ elu, nke e ji nkume mabụl na nkume ndị ọzọ dị oke ọnụahịa, ndị na-acha ezi ọcha, ndị na-acha odo odo na nke na-eji oji wuo ala ya.
7E jikwa iko ọlaedo ṅụọ ihe ọṅụṅụ. Iko ọlaedo ọbụla e wepụtara nʼụbọchị ahụ dị iche nʼiche. O nweghị nke yiri ibe ya. E mekwara ka mmanya eze baa ụba dịka afọ ọma aka eze si dị. 8E nyeghịkwa iwu ọbụla banyere iko mmanya ole mmadụ kwesiri ịṅụ kama ndị chọrọ ga-aṅụ dịka o si masị ha. Nʼihi na eze agwalarị ndịisi ozi ya na onye ọbụla kwesiri ịṅụ dịka o si chọọ.

9Nʼotu oge ahụ, eze nwanyị Vashti, kpọkwara oke oriri nye ụmụ nwanyị niile nọ nʼụlọeze, Sekses.

10Nʼụbọchị nke asaa, mgbe obi dị eze Sekses mma nʼihi mmanya ọ ṅụrụ, ọ nyere ndị onozi asaa ndị a na-ejere ya ozi iwu, ha bụ, Mehuman, na Bizta, na Habona, na Bigta, na Abagta, na Zeta, na Kakas, 11sị ha gaa kpọọ Vashti nwunye eze ka ọ bịakwute ya. Eze nyekwara iwu ka Vashti kpuru okpueze nʼisi ya, maka igosi ndị mmadụ niile na ndị a na-asọpụrụ nọ nʼebe ahụ ịma mma ya. Nʼihi na Vashti mara mma. 12Ma mgbe e mere ka ozi eze ruo ya ntị, eze nwanyị, bụ Vashti jụrụ ịbịa. Nke a mere ka iwe wee eze nke ukwuu.

13Dịka eze Sekses na-eme, ọ kpọkwara ndị ọkachamara nʼihe gbasara iwu na ikpe ziri ezi. Eze na ndị a mara ihe, bụ ndị maara ihe ụbọchị nyere kparịtara ụka. 14Ha bụkwa ndị na-anọkarị eze nso. Aha ha bụ Kashena, na Sheta, na Admata, na Tashish, na Meres, na Masena, na Memukan. A maara aha mmadụ asaa ndị a nʼala Midia na Peshịa. Ha bụ ndị na-aga nʼihu eze mgbe ọbụla ha chọrọ, bụrụkwa ndị dịkarịsịrị elu nʼalaeze ahụ.

15Eze jụrụ sị, “Dịka iwu si dị, gịnị ka a ga-eme Vashti bụ nwunye eze nʼihi na o nupuru isi nʼiwu eze Sekses nyere nke o zigaara ya site nʼọnụ ndị onozi ya?”

16Memukan kwuchitere ọnụ ndị ọzọ sị, “Ihe Vashti nwunye eze mere jọrọ njọ. O mehiela eze, mehiekwa ndị ọchịchị niile, na ndị niile bi nʼakụkụ niile nke alaeze Sekses. 17Nʼihi na ndị inyom niile ga-amata ihe eze nwanyị mere, malite ilelị ndị di ha anya, ma na-ekwu sị, ‘Eze Sekses nyere Vashti nwunye ya iwu ka ọ bịa nʼihu ya, ma ọ jụrụ ịbịa.’ 18Nʼụbọchị taa ka ndị inyom ndịisi nke Peshịa na Midia, bụ ndị nụrụ banyere omume nwunye eze mere, ga-azakwa ndịisi ọchịchị alaeze gị nʼụzọ dị otu a. A ga-enwe nleda anya na esemokwu nʼala a mgbe niile.

19“Ya mere, ọ bụrụ na ọ masị eze, ya nye iwu, nke a ga-edepụta, ka ọ bụrụ iwu nʼala Peshịa na Midia, nke na-agaghị agbanwe, na Vashti agaghị abatakwa nʼihu eze Sekses ọzọ. Ka eze werekwa ọnọdụ eze nwanyị ahụ nye onye ọzọ ka ya mma. 20Ọ ga-erukwa na mgbe a gụpụtara iwu a eze nyere nʼakụkụ alaeze a niile, ndị inyom niile ga-asọpụrụ ndị di ha site nʼonye dịkarịsịrị nta nʼetiti ha ruo nʼonye dị ukwuu.”

21Eze na ndịisi ọchịchị ya nabatara ndụmọdụ a, nʼihi ya, eze mere ihe Memukan kwuru. 22O zipụrụ akwụkwọ ozi a nye akụkụ niile a na-achị achị nke alaeze ahụ. E dekwara akwụkwọ ozi ahụ nʼasụsụ dị iche iche, na-ekwupụta nʼasụsụ ọbụla na nwoke ọbụla kwesiri ịbụ onye na-achị ezinaụlọ ya.

Copyright information for IboBIU